18Ihe ike agaghị adịkwa nʼala gị ọzọ. Agha niile ga-akwụsị, mbibi na ịla nʼiyi agaghị adịkwa. Mgbidi gị ga-aghọ Nzọpụta, ị ga-akpọkwa ọnụ ụzọ ama gị niile Otuto.
19Anyanwụ agaghị abụkwara gị ìhè nʼehihie ọzọ, maọbụ maramara nke ọnwa amụkwasị gị ihe, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị ga-abụrụ gị ìhè ruo ebighị ebi, Chineke gị ga-abụkwa ebube gị.
20Anwụ gị agaghị ada ada, ọnwa gị agaghị akwụsịkwa ịcha; nʼihi na Onyenwe anyị ga-abụrụ gị ìhè ụbọchị gị niile, iru ụjụ gị niile ga-agabigakwa.
21Mgbe ahụ, ndị gị niile ga-abụ ndị ezi omume, ha ga-enwetakwa ala ahụ ruo ebighị ebi. Ha bụ ome nke m kụrụ, bụ ọrụ aka m, ime ka ịma mma m pụta ìhè.
22Ezinaụlọ dị nta ga-aba ụba ghọọ obodo, mba nta ga-aghọ obodo buru ibu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, ga-eme ka ha niile mezuo ọsịịsọ nʼoge ya.”