16Ị ga-aṅụ mmiri ara nke mba dị iche iche, ọ bụkwa ara ndị eze ka a ga-eji zuo gị. Mgbe ahụ, ị ga-amata nʼezie na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nzọpụta gị na Onye mgbapụta gị, Onye dị ike nke Jekọb.
17Nʼọnọdụ bronz, aga m eweta ọlaedo, nʼọnọdụ igwe aga m eweta ọlaọcha. Nʼọnọdụ osisi, ọ ga-abụ ọla, nʼọnọdụ nkume, ọ ga-abụ igwe. M ga-eme ka udo bụrụ ndị nlekọta gị ezi omume ga-abụ onye na-achị gị.
18Ihe ike agaghị adịkwa nʼala gị ọzọ. Agha niile ga-akwụsị, mbibi na ịla nʼiyi agaghị adịkwa. Mgbidi gị ga-aghọ Nzọpụta, ị ga-akpọkwa ọnụ ụzọ ama gị niile Otuto.
19Anyanwụ agaghị abụkwara gị ìhè nʼehihie ọzọ, maọbụ maramara nke ọnwa amụkwasị gị ihe, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị ga-abụrụ gị ìhè ruo ebighị ebi, Chineke gị ga-abụkwa ebube gị.
20Anwụ gị agaghị ada ada, ọnwa gị agaghị akwụsịkwa ịcha; nʼihi na Onyenwe anyị ga-abụrụ gị ìhè ụbọchị gị niile, iru ụjụ gị niile ga-agabigakwa.