3Mba niile dị iche iche ga-abịakwute ìhè gị, ndị eze niile ga-abịaru mmụke nke ọwụwa gị.
4“Welienụ anya unu abụọ elu legharịa gburugburu unu, ha niile na-ezukọta na-abịakwute gị; ụmụ gị ndị ikom na-esi nʼebe dị anya bịa, ụmụ gị ndị inyom ka a ga-ekukwa nʼụkwụ.
5Mgbe ahụ, ị ga-elepụ anya ma chakee, obi gị ga-atọ gị ụtọ, saa mbara nʼihi ọṅụ, nʼihi na akụ niile nke osimiri ka a ga-ewebatara gị, akụnụba nke ọtụtụ mba ga-abịara gị.
6Ọtụtụ igwe ịnyịnya kamel nke si Midia na Efaa ga-ejupụta nʼala gị, ma ndị sikwa nʼobodo Sheba ga-ebutere gị ọlaedo na ụda na-esi isi ụtọ. Ha ga-ekwusakwa otuto Onyenwe anyị.
7A ga-enye gị igwe ewu na atụrụ niile nke ndị Keda. Ebule niile nke Nebaiot ga-abụ nke gị. A ga-anabata ha dịka onyinye nʼelu ebe ịchụ aja m. Aga m edozi ụlọnsọ m dị ebube, mee ya ka ọ maa mma karịa.