2Lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa niile, oke ọchịchịrị na-ekpuchi ndị niile bi nʼụwa, ma Onyenwe anyị ga-awa dịka anyanwụ nʼahụ gị ebube ya ga-achakwa ka ihe nʼebe i nọ.
3Mba niile dị iche iche ga-abịakwute ìhè gị, ndị eze niile ga-abịaru mmụke nke ọwụwa gị.
4“Welienụ anya unu abụọ elu legharịa gburugburu unu, ha niile na-ezukọta na-abịakwute gị; ụmụ gị ndị ikom na-esi nʼebe dị anya bịa, ụmụ gị ndị inyom ka a ga-ekukwa nʼụkwụ.
5Mgbe ahụ, ị ga-elepụ anya ma chakee, obi gị ga-atọ gị ụtọ, saa mbara nʼihi ọṅụ, nʼihi na akụ niile nke osimiri ka a ga-ewebatara gị, akụnụba nke ọtụtụ mba ga-abịara gị.
6Ọtụtụ igwe ịnyịnya kamel nke si Midia na Efaa ga-ejupụta nʼala gị, ma ndị sikwa nʼobodo Sheba ga-ebutere gị ọlaedo na ụda na-esi isi ụtọ. Ha ga-ekwusakwa otuto Onyenwe anyị.