Aịzaya 61

Obi na-atọ m ụtọ nke ukwuu nʼime Onyenwe anyị, mkpụrụobi m ga-etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke m. Nʼihi na o werela uwe nzọpụta kpuchie m, werekwa uwe oke ọṅụ nke ezi omume ya yikwasị m nʼahụ. Adị m ka nwoke na-alụ nwanyị ọhụrụ, onye na-emezi isi ya ka ọ dịrị ka nke onye nchụaja. E, adị m ka nwaagbọghọ na-alụ di, nke ji ọla ọma dị iche iche chọọ onwe ya mma.

Isaiah 61:10 (UKJV) I will greatly rejoice in the LORD, my soul shall be joyful in my God; for he has clothed me with the garments of salvation, he has covered me with the robe of righteousness, as a bridegroom decks himself with ornaments, and as a bride adorns herself with her jewels.

8“Nʼihi na mụ onwe m, Onyenwe anyị, na-ahụ ikpe ziri ezi nʼanya. Ma ana m akpọ izu ohi na ajọ omume niile asị. Aga m esite nʼikwesị ntụkwasị obi m kwụghachi ndị m nʼihi ahụhụ ha tara, mụ na ha ga-agbakwa ndụ ebighị ebi.

9Mkpụrụ ha ga-abụ ndị a ma ama, a ga-asọpụkwara ha nʼetiti mba niile. Ndị niile hụrụ ha ga-amata, kwupụtakwa na ha bụ ndị Onyenwe anyị gọziri.”

10Obi na-atọ m ụtọ nke ukwuu nʼime Onyenwe anyị, mkpụrụobi m ga-etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke m. Nʼihi na o werela uwe nzọpụta kpuchie m, werekwa uwe oke ọṅụ nke ezi omume ya yikwasị m nʼahụ. Adị m ka nwoke na-alụ nwanyị ọhụrụ, onye na-emezi isi ya ka ọ dịrị ka nke onye nchụaja. E, adị m ka nwaagbọghọ na-alụ di, nke ji ọla ọma dị iche iche chọọ onwe ya mma.

11Dịka aja dị nʼubi si eme ka ihe a kụrụ nʼubi pupụta, dịka ubi a gbara ogige si eme ka mkpụrụ ubi too, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-esi mee ka ezi omume na otuto pupụta nʼihu mba niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.