9Mkpụrụ ha ga-abụ ndị a ma ama, a ga-asọpụkwara ha nʼetiti mba niile. Ndị niile hụrụ ha ga-amata, kwupụtakwa na ha bụ ndị Onyenwe anyị gọziri.”
10Obi na-atọ m ụtọ nke ukwuu nʼime Onyenwe anyị, mkpụrụobi m ga-etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke m. Nʼihi na o werela uwe nzọpụta kpuchie m, werekwa uwe oke ọṅụ nke ezi omume ya yikwasị m nʼahụ. Adị m ka nwoke na-alụ nwanyị ọhụrụ, onye na-emezi isi ya ka ọ dịrị ka nke onye nchụaja. E, adị m ka nwaagbọghọ na-alụ di, nke ji ọla ọma dị iche iche chọọ onwe ya mma.
11Dịka aja dị nʼubi si eme ka ihe a kụrụ nʼubi pupụta, dịka ubi a gbara ogige si eme ka mkpụrụ ubi too, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-esi mee ka ezi omume na otuto pupụta nʼihu mba niile.