Aịzaya 63

Ma ha nupuru isi megide ya, meekwa ka obi jọọ Mmụọ Nsọ ya njọ. Ọ bụ ya mere o ji ghọọ onye iro ha, lụsokwa ha ọgụ nʼonwe ya.

Isaiah 63:10 (UKJV) But they rebelled, and vexed his holy Spirit: therefore he was turned to be their enemy, and he fought against them.

8Nʼihi na Onyenwe anyị sịrị, “Ndị a bụ nke m; e, ha agakwaghị agọnarị m ọzọ.” Ya mere, ọ ghọọrọ ha Onye nzọpụta.

9Nʼime mkpagbu ha niile, a kpagbukwara ya onwe ya, ọ bụkwa mmụọ ozi nke ihu ya zọpụtara ha. Nʼime ịhụnanya ya na obi ebere ya, ọ gbapụtara ha, bulie ha elu, kuru ha ogologo ụbọchị ndị a niile ndị gara aga.

10Ma ha nupuru isi megide ya, meekwa ka obi jọọ Mmụọ Nsọ ya njọ. Ọ bụ ya mere o ji ghọọ onye iro ha, lụsokwa ha ọgụ nʼonwe ya.

11Mgbe ahụ, ndị ya chetara ụbọchị ndị ahụ gara aga, ụbọchị Mosis na ndị nke ya. Olee ebe onye ahụ nọ nke mere ka ha si nʼoke osimiri rigopụta, ya na onye ọzụzụ atụrụ nke igwe atụrụ ya? Olee ebe onye ahụ tinyere Mmụọ Nsọ ya nʼetiti ha nọ.

12Olee onye ahụ ike ya mere ka osimiri kewaa abụọ nʼihu ha, mgbe Mosis weliri aka ya elu, meekwa ka aha ya dịgide ruo ebighị ebi?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.