6Nʼiwe m, azọpịara mba niile dị iche iche; esitere m nʼọnụma juru m obi zọpịasịa ha. Emekwara ka ọbara ndụ ha bụrụ ihe a wụsiri nʼala.”
7Aga m ekwupụta ihe banyere ịhụnanya Onyenwe anyị. Aga m eto ya nʼihi ihe niile o mere. Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi ịdị mma ya nʼebe Izrel nọ, e, nʼihi ọtụtụ ihe ọma o mere nʼihi mmeso ọma niile o mesoro ụlọ Izrel, nke ọ na-emeso ha dịka obi ebere ya na ọmịiko ya si dị.
8Nʼihi na Onyenwe anyị sịrị, “Ndị a bụ nke m; e, ha agakwaghị agọnarị m ọzọ.” Ya mere, ọ ghọọrọ ha Onye nzọpụta.
9Nʼime mkpagbu ha niile, a kpagbukwara ya onwe ya, ọ bụkwa mmụọ ozi nke ihu ya zọpụtara ha. Nʼime ịhụnanya ya na obi ebere ya, ọ gbapụtara ha, bulie ha elu, kuru ha ogologo ụbọchị ndị a niile ndị gara aga.
10Ma ha nupuru isi megide ya, meekwa ka obi jọọ Mmụọ Nsọ ya njọ. Ọ bụ ya mere o ji ghọọ onye iro ha, lụsokwa ha ọgụ nʼonwe ya.