4Nʼihi na ọ bụ ụbọchị m ji abọ ọbọ; afọ mgbapụta m kwadoro eruola.
5Elere m anya ma o nweghị onye bịara inyere m aka. O juru m anya, jukwa m ọnụ, na o nweghị onye pụtara inyere m aka. Nʼihi ya, aka m wetara m mmeri. Ọ bụkwa ọnụma juru m obi gbara m ume imezu ya.
6Nʼiwe m, azọpịara mba niile dị iche iche; esitere m nʼọnụma juru m obi zọpịasịa ha. Emekwara ka ọbara ndụ ha bụrụ ihe a wụsiri nʼala.”
7Aga m ekwupụta ihe banyere ịhụnanya Onyenwe anyị. Aga m eto ya nʼihi ihe niile o mere. Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi ịdị mma ya nʼebe Izrel nọ, e, nʼihi ọtụtụ ihe ọma o mere nʼihi mmeso ọma niile o mesoro ụlọ Izrel, nke ọ na-emeso ha dịka obi ebere ya na ọmịiko ya si dị.
8Nʼihi na Onyenwe anyị sịrị, “Ndị a bụ nke m; e, ha agakwaghị agọnarị m ọzọ.” Ya mere, ọ ghọọrọ ha Onye nzọpụta.