Aịzaya 63

Dịka ehi na-ata ahịhịa na ndagwurugwu, Mmụọ Onyenwe anyị nyere ha izuike. Otu a ka i si duo ndị gị, ime ka aha gị bụrụ ihe a na-asọpụrụ asọpụrụ.

Isaiah 63:14 (UKJV) As a beast goes down into the valley, the Spirit of the LORD caused him to rest: so did you lead your people, to make yourself a glorious name.

12Olee onye ahụ ike ya mere ka osimiri kewaa abụọ nʼihu ha, mgbe Mosis weliri aka ya elu, meekwa ka aha ya dịgide ruo ebighị ebi?

13Onye duuru ha gafee mmiri dị oke omimi? Dịka ịnyịnya na-agba ọsọ nʼọzara, ike agwụghị ha.

14Dịka ehi na-ata ahịhịa na ndagwurugwu, Mmụọ Onyenwe anyị nyere ha izuike. Otu a ka i si duo ndị gị, ime ka aha gị bụrụ ihe a na-asọpụrụ asọpụrụ.

15Onyenwe anyị, biko site nʼeluigwe, ebe obibi nsọ gị, lee anyị anya. Olee ebe nʼịnụ ọkụ nʼobi na ike gị dị? Olee ebe obi ebere gị na ọmịiko gị dịkwa?

16Ma gị onwe gị, bụ Nna anyị, a sịkwarị na Ebraham amaghị anyị maọbụ Izrel agọnarị anyị, gị onwe gị, Onyenwe anyị, bụ Nna anyị, onye Mgbapụta anyị ka ị na-azakwa siterị na mgbe ochie.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.