Aịzaya 63

Onyenwe anyị, biko site nʼeluigwe, ebe obibi nsọ gị, lee anyị anya. Olee ebe nʼịnụ ọkụ nʼobi na ike gị dị? Olee ebe obi ebere gị na ọmịiko gị dịkwa?

Isaiah 63:15 (UKJV) Look down from heaven, and behold from the habitation of your holiness and of your glory: where is your zeal and your strength, the sounding of your bowels and of your mercies toward me? are they restrained?

13Onye duuru ha gafee mmiri dị oke omimi? Dịka ịnyịnya na-agba ọsọ nʼọzara, ike agwụghị ha.

14Dịka ehi na-ata ahịhịa na ndagwurugwu, Mmụọ Onyenwe anyị nyere ha izuike. Otu a ka i si duo ndị gị, ime ka aha gị bụrụ ihe a na-asọpụrụ asọpụrụ.

15Onyenwe anyị, biko site nʼeluigwe, ebe obibi nsọ gị, lee anyị anya. Olee ebe nʼịnụ ọkụ nʼobi na ike gị dị? Olee ebe obi ebere gị na ọmịiko gị dịkwa?

16Ma gị onwe gị, bụ Nna anyị, a sịkwarị na Ebraham amaghị anyị maọbụ Izrel agọnarị anyị, gị onwe gị, Onyenwe anyị, bụ Nna anyị, onye Mgbapụta anyị ka ị na-azakwa siterị na mgbe ochie.

17Onyenwe anyị, gịnị mere i ji na-eme ka anyị si nʼụzọ gị kpafuo na-eme ka obi anyị sie ike otu a, na anyị adịghị atụ egwu gị? Lọghachi nʼihi ndị ohu gị, nʼihi ebo ndị ahụ bụ ihe nketa gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.