10Obodo nsọ gị niile aghọọla ọzara; ọ bụladị Zayọn aghọọla ọzara, Jerusalem, ebe tọgbọrọ nʼefu.
11Ụlọnsọ ukwu anyị ahụ mara mma, nke dịkwa nsọ, ebe nna anyị ha nọ too gị, ma feekwa gị ofufe, abụrụla ihe a gbara ọkụ. Ihe niile mara mma nʼime ya alaala nʼiyi.
12Mgbe ihe niile gasịrị, Onyenwe anyị, ị ga-ejisi onwe gị ike? Ị ga-agba nkịtị, taa anyị ahụhụ ebe ọ gafere oke?