Aịzaya 64

Nʼihi na site na mgbe ochie, ọ dịbeghị onye nụrụ, ọ dịbeghị ntị ghọtara, o nwebeghị anya hụrụ Chineke ọzọ karịa gị, onye na-emejupụtara ndị na-echere ya ihe na-akpa ha.

Isaiah 64:4 (UKJV) For since the beginning of the world men have not heard, nor perceived by the ear, neither has the eye seen, O God, beside you, what he has prepared for him that waits for him.

2Dịka mgbe ọkụ na-agba ụmụ osisi, na-eme ka mmiri e sikwasịrị nʼọkụ gbọọ. Si nʼelu rịdata bịa mee ka ndị iro gị niile maara aha gị, meekwa ka mba niile dị iche iche maa jijiji nʼihu gị.

3Nʼihi na ọ bụ mgbe i mere ọtụtụ ihe egwu dị iche iche nke anyị na-atụghị anya ya ka ị rịdatara mee ka ugwu ukwu niile maa jijiji nʼihu gị.

4Nʼihi na site na mgbe ochie, ọ dịbeghị onye nụrụ, ọ dịbeghị ntị ghọtara, o nwebeghị anya hụrụ Chineke ọzọ karịa gị, onye na-emejupụtara ndị na-echere ya ihe na-akpa ha.

5Ị na-enyere ndị na-eme ezi ihe aka, bụ ndị ji ọṅụ na-echeta ụzọ gị nʼechiche uche ha. Ma mgbe anyị nọgidere na-emehie megide ha, iwe were gị. A ga-esikwanụ aṅaa zọpụta anyị?

6Anyị niile dịka onye rụrụ arụ, ezi omume anyị niile kwa dịka nkịrịnka akwa ruru unyi. Anyị akpọnwụọla dịka akwụkwọ osisi, mmehie anyị na-ebufukwa anyị dịka ifufe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.