3Nʼihi na ọ bụ mgbe i mere ọtụtụ ihe egwu dị iche iche nke anyị na-atụghị anya ya ka ị rịdatara mee ka ugwu ukwu niile maa jijiji nʼihu gị.
4Nʼihi na site na mgbe ochie, ọ dịbeghị onye nụrụ, ọ dịbeghị ntị ghọtara, o nwebeghị anya hụrụ Chineke ọzọ karịa gị, onye na-emejupụtara ndị na-echere ya ihe na-akpa ha.
5Ị na-enyere ndị na-eme ezi ihe aka, bụ ndị ji ọṅụ na-echeta ụzọ gị nʼechiche uche ha. Ma mgbe anyị nọgidere na-emehie megide ha, iwe were gị. A ga-esikwanụ aṅaa zọpụta anyị?
6Anyị niile dịka onye rụrụ arụ, ezi omume anyị niile kwa dịka nkịrịnka akwa ruru unyi. Anyị akpọnwụọla dịka akwụkwọ osisi, mmehie anyị na-ebufukwa anyị dịka ifufe.
7Ọ dịghị onye nʼime anyị na-arịọ gị arịrịọ; ọ dịkwaghị onye na-akpọku aha gị. Nʼihi ya, i zoola ihu gị site nʼebe anyị nọ, meekwa ka anyị bụrụ ndị gbazere agbaze nʼihi mmehie anyị.