5Ị na-enyere ndị na-eme ezi ihe aka, bụ ndị ji ọṅụ na-echeta ụzọ gị nʼechiche uche ha. Ma mgbe anyị nọgidere na-emehie megide ha, iwe were gị. A ga-esikwanụ aṅaa zọpụta anyị?
6Anyị niile dịka onye rụrụ arụ, ezi omume anyị niile kwa dịka nkịrịnka akwa ruru unyi. Anyị akpọnwụọla dịka akwụkwọ osisi, mmehie anyị na-ebufukwa anyị dịka ifufe.
7Ọ dịghị onye nʼime anyị na-arịọ gị arịrịọ; ọ dịkwaghị onye na-akpọku aha gị. Nʼihi ya, i zoola ihu gị site nʼebe anyị nọ, meekwa ka anyị bụrụ ndị gbazere agbaze nʼihi mmehie anyị.
8Ma otu ọbụla o si dị, gị Onyenwe anyị bụ Nna anyị. Anyị bụ ụrọ, ma ị bụ ọkpụ ite. Ọ bụ aka gị kpụrụ anyị niile.
9Biko, Onyenwe anyị, anọgidela na-eweso anyị iwe; echetakwala mmehie anyị ọzọ ruo mgbe ebighị ebi. Biko, lekwasị anyị anya nʼihi na ndị gị ka anyị bụ.