Aịzaya 65

“Nʼihi na lee, ana m eke eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. Ọ dịghị onye ga-echetakwa ndị ochie ahụ ọzọ; ọ gaghị abatakwa nʼechiche onye ọbụla.

Isaiah 65:17 (UKJV) For, behold, I create new heavens and a new earth: and the former shall not be remembered, nor come into mind.

15Unu ga-ahapụ aha unu nye ndị m họpụtara nye onwe m ka ọ bụrụ ihe ha ji abụ ọnụ; nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-etigbu unu, ma ọ ga-akpọ ndị ohu ya aha ọzọ.

16Onye ọbụla na-ekpe ekpere nʼala ahụ, ga-eme otu a nʼaha Chineke nke eziokwu, onye ọbụla na-aṅụkwa iyi nʼime ala ahụ ga-aṅụ iyi nʼaha Chineke nke eziokwu. Nʼihi na-echezolam nsogbu niile ndị gara aga, zokwa ha site nʼanya m.

17“Nʼihi na lee, ana m eke eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. Ọ dịghị onye ga-echetakwa ndị ochie ahụ ọzọ; ọ gaghị abatakwa nʼechiche onye ọbụla.

18Ma ṅụrịanụ ọṅụ, tegharịakwa mgbe niile nʼobi ụtọ nʼihi ihe nke mụ onwe m na-eke, nʼihi na-aga eke Jerusalem ka ọ bụrụ ihe ọṅụ ndị ya ga-abụkwa ihe obi ụtọ.

19Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi Jerusalem, nweekwa obi ụtọ nʼihi ndị m; a gaghị anụkwa olu ịkwa akwa nʼime ya ọzọ, maọbụ olu iti mkpu akwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.