Aịzaya 66

Ọ bụ gịnị bụ mkpọtụ dị nʼime obodo? Gịnị bụ oke ụzụ na-ada nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị? Ọ bụ ụzụ Onyenwe anyị na-eme. Onye ahụ na-akwụghachi ndị iro ya ụgwọ ruuru ha.

Isaiah 66:6 (UKJV) A voice of noise from the city, a voice from the temple, a voice of the LORD that renders recompence to his enemies.

4Ya mere, aga m ezitere ha ahụhụ dị egwu, mee ka ihe ahụ ha na-atụ egwu ya bịakwasị ha. Nʼihi na mgbe m kpọrọ ha oku, ha azaghị, mgbe m gwara ha okwu, ha egeghị ntị. Kama ha mere ihe ọjọọ nʼihu m, họrọkwa ime ihe ndị ahụ ha maara na m kpọrọ asị.”

5Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị na-ama jijiji nʼokwu ya, “Ụmụnna unu, ndị kpọrọ unu asị, ndị chụpụkwara unu nʼihi aha m, ekwuola sị, ‘Ka a sọpụrụ Onyenwe anyị! Ka anyị lee ụdị ọṅụ ga-abụ nke unu!’ Ma a ga-etinye ha nʼọnọdụ ihere.

6Ọ bụ gịnị bụ mkpọtụ dị nʼime obodo? Gịnị bụ oke ụzụ na-ada nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị? Ọ bụ ụzụ Onyenwe anyị na-eme. Onye ahụ na-akwụghachi ndị iro ya ụgwọ ruuru ha.

7“Tupu ime amalite ime ya, ọ mụpụtalarị nwa ya. Tupu ihe mgbu ya ebido, ọ mụpụtala nwa nwoke.

8Onye jiri ntị ya nụtụ ihe dị otu a mbụ? Onye kwa ji anya ya hụ ihe dị otu a? A pụrụ ịmụpụta otu mba nʼotu ụbọchị? Ka e nwere ike ime ka otu obodo malite ịdị nʼotu ntabi anya? Lee na tupu ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ya ebido Zayọn amụpụtala ụmụ ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.