5Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị na-ama jijiji nʼokwu ya, “Ụmụnna unu, ndị kpọrọ unu asị, ndị chụpụkwara unu nʼihi aha m, ekwuola sị, ‘Ka a sọpụrụ Onyenwe anyị! Ka anyị lee ụdị ọṅụ ga-abụ nke unu!’ Ma a ga-etinye ha nʼọnọdụ ihere.
6Ọ bụ gịnị bụ mkpọtụ dị nʼime obodo? Gịnị bụ oke ụzụ na-ada nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị? Ọ bụ ụzụ Onyenwe anyị na-eme. Onye ahụ na-akwụghachi ndị iro ya ụgwọ ruuru ha.
7“Tupu ime amalite ime ya, ọ mụpụtalarị nwa ya. Tupu ihe mgbu ya ebido, ọ mụpụtala nwa nwoke.
8Onye jiri ntị ya nụtụ ihe dị otu a mbụ? Onye kwa ji anya ya hụ ihe dị otu a? A pụrụ ịmụpụta otu mba nʼotu ụbọchị? Ka e nwere ike ime ka otu obodo malite ịdị nʼotu ntabi anya? Lee na tupu ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ya ebido Zayọn amụpụtala ụmụ ya.
9Mụ onwe m, m ga-eme ka nwa rute nʼoge ọmụmụ gharakwa ime ka a mụọ ya?” ka Onyenwe anyị na-ekwu. “M ga-emechi akpanwa mgbe m na-eme ka a mụpụta ya?” ka Chineke gị jụrụ.