Aịzaya 7

“Jụọ m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, ka m meere gị ihe ịrịbama nke ga-egosi gị na m ga-ebibi ndị iro gị niile dịka m kwuru. Rịọọ m ihe masịrị gị, nʼebe dị elu nʼeluigwe maọbụ nʼebe kachasị omimi nʼụwa.”

Isaiah 7:11 (UKJV) Ask you a sign of the LORD your God; ask it either in the depth, or in the height above.

9Isi obodo Ifrem bụ Sameria. Onyeisi Sameria bụ naanị nwa Remalaya. Ọ bụrụ na unu eguzosighị ike nʼokwukwe unu, unu agaghị eguzo ma ọlị.’ ”

10Ọ dịghị anya, Onyenwe anyị ziri Ehaz ozi ndị a sị,

11“Jụọ m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, ka m meere gị ihe ịrịbama nke ga-egosi gị na m ga-ebibi ndị iro gị niile dịka m kwuru. Rịọọ m ihe masịrị gị, nʼebe dị elu nʼeluigwe maọbụ nʼebe kachasị omimi nʼụwa.”

12Ma Ehaz zara sị, “Mba, agaghị arịọ, agaghị m anwakwa Onyenwe anyị m otu a.”

13Ma Aịzaya sịrị, “Ṅaanụ ntị unu ụlọ Devid. Ọ bụ na o zurughị unu ime ka ike gwụ mmadụ? Unu ga-emekwa ka ike gwụ Chineke nʼonwe ya?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.