Aịzaya 8

Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ya ka unu ga-edo nsọ. Ya bụ onye unu kwesiri ịtụ ụjọ. Ya bụ onye unu ga-atụ egwu ma jijiji.

Isaiah 8:13 (UKJV) Sanctify the LORD of hosts himself; and let him be your fear, and let him be your dread.

11Otu a ka Onyenwe anyị sịrị m nʼike nke aka ya dị nʼahụ, ọ dọrọ m aka na ntị ka m ghara ije ije nʼụzọ ndị nke a, na-asị:

12“Adịnyerela ha nʼihe niile ha na-ezube ime na nzuzo megide ọchịchị; ka ihe ha na-atụ egwu hapụ ịbụ ihe ga-eme ka ị tụọ egwu.

13Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ya ka unu ga-edo nsọ. Ya bụ onye unu kwesiri ịtụ ụjọ. Ya bụ onye unu ga-atụ egwu ma jijiji.

14Ọ ga-abụkwa ebe nsọ; nye ụlọ Izrel na Juda, ọ ga-aghọrọ ha nkume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ, oke nkume nke na-eme ka ha daa. Ọ ga-abụkwara ndị Jerusalem igbudu na ọnya nke ha ga-adaba nʼime ya.

15Ọtụtụ nʼime ha ga-asọ ngọngọ; ha ga-ada bụrụ ndị e tipịara. Ha ga-abụ ndị ọnya ga-ama, na ndị a ga-anwude.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.