3Emesịa, mụ na nwunye m, bụ onye amụma dinakọrọ, ọ tụụrụ ime, mụọrọ m nwa nwoke. Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Gụọ ya Maha-shalal-Hash-Baz.
4Nʼihi na tupu nwantakịrị ahụ etolite ịkpọ nne maọbụ nna, eze ndị Asịrịa ga-ebuso Damaskọs na Sameria agha, bukọrọkwa akụ ha niile.”
5Onyenwe anyị gwakwara m okwu ọzọ sị,
6“Nʼihi na ndị a ajụla mmiri Shiloa nke ji nwayọọ na-asọ ma na-aṅụrị ọṅụ nʼihi Rezin na nwa nwoke Remalaya,
7ya mere, Onyenwe anyị na-aga iweta iju mmiri nke osimiri Yufretis megide ha, bụ eze ndị Asịrịa ya na ebube ya niile. Ọ ga-erubiga oke, gafee ụzọ ya niile, ọ ga-erubiga ma tofeekwa ọnụ ya niile,