5Onyenwe anyị gwakwara m okwu ọzọ sị,
6“Nʼihi na ndị a ajụla mmiri Shiloa nke ji nwayọọ na-asọ ma na-aṅụrị ọṅụ nʼihi Rezin na nwa nwoke Remalaya,
7ya mere, Onyenwe anyị na-aga iweta iju mmiri nke osimiri Yufretis megide ha, bụ eze ndị Asịrịa ya na ebube ya niile. Ọ ga-erubiga oke, gafee ụzọ ya niile, ọ ga-erubiga ma tofeekwa ọnụ ya niile,
8wụsịakwa nʼala Juda niile. Ọ ga-erikpu ala Juda niile, ọ ga-agabiga, kpuchiekwa ọ bụladị nʼolu ka ọ ga-eru. Nku ya ga-agbasa kpuchie obosara niile nke ala gị, O Ịmanụel.”
9Tienụ mkpu agha unu mba dị iche iche, ma a ga-etipịa unu. Geenụ ntị unu mba niile dị ebe dị anya. Kwadoonụ maka agha ma a ga-etipịa unu. Kwadoonụ maka agha ka e tipịa unu.