7ya mere, Onyenwe anyị na-aga iweta iju mmiri nke osimiri Yufretis megide ha, bụ eze ndị Asịrịa ya na ebube ya niile. Ọ ga-erubiga oke, gafee ụzọ ya niile, ọ ga-erubiga ma tofeekwa ọnụ ya niile,
8wụsịakwa nʼala Juda niile. Ọ ga-erikpu ala Juda niile, ọ ga-agabiga, kpuchiekwa ọ bụladị nʼolu ka ọ ga-eru. Nku ya ga-agbasa kpuchie obosara niile nke ala gị, O Ịmanụel.”
9Tienụ mkpu agha unu mba dị iche iche, ma a ga-etipịa unu. Geenụ ntị unu mba niile dị ebe dị anya. Kwadoonụ maka agha ma a ga-etipịa unu. Kwadoonụ maka agha ka e tipịa unu.
10Tụọnụ atụmatụ unu ma a ga-ekposa ya. Wepụtanụ atụmatụ unu ma ọ gaghị eguzo nʼihi na Chineke nọnyere anyị.
11Otu a ka Onyenwe anyị sịrị m nʼike nke aka ya dị nʼahụ, ọ dọrọ m aka na ntị ka m ghara ije ije nʼụzọ ndị nke a, na-asị: