19Nʼihi iwe ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ewe, ahụhụ ọ ga-enye ga-adị ka ọkụ na-ere ere; ọ na-erepịa ala ahụ niile na ndị bi nʼime ya; ọ dịkwaghị onye ga-azọpụta ibe ya.
20Nʼala ahụ niile, ma nʼaka nri ma nʼaka ekpe, onye ọbụla ga-agbalị ịdọtara onwe ya ihe oriri. Ha ga-eri ma afọ agaghị eju ha; nʼezie, ha ga-eri ọ bụladị anụ ahụ ụmụ nke aka ha.
21Ndị Manase ga-alụso ndị Ifrem ọgụ, ndị Ifrem ga-alụsokwa ndị Manase ọgụ. Ha abụọ kwa ga-ejikọta aka lụso Juda ọgụ. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ. Aka ya ka setịpụkwara esetipụ.