1Ahụhụ na-adịrị ndị niile na-atụpụta iwu na-ezighị ezi; ndị niile na-atụpụta iwu mmegbu,
2iji napụ ndị ogbenye ihe ruru ha nakwa ịnapụ ndị m a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi, na-emekwa ka ụmụ nwanyị di ha nwụrụ bụrụ anụ oriri ha na izunara ụmụ na-enweghị nne na nna ihe ha nwere.
3Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-abịa ileta unu? Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-eweta ịla nʼiyi, nke ga-esi nʼebe dị anya bịara unu? Onye ka unu ga-agbakwuru maka enyemaka? Ọ bụ ebe ka unu ga-ahapụ akụ unu niile?