Aịzaya 10

Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-abịa ileta unu? Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-eweta ịla nʼiyi, nke ga-esi nʼebe dị anya bịara unu? Onye ka unu ga-agbakwuru maka enyemaka? Ọ bụ ebe ka unu ga-ahapụ akụ unu niile?

Isaiah 10:3 (UKJV) And what will all of you do in the day of visitation, and in the desolation which shall come from far? to whom will all of you flee for help? and where will all of you leave your glory?

1Ahụhụ na-adịrị ndị niile na-atụpụta iwu na-ezighị ezi; ndị niile na-atụpụta iwu mmegbu,

2iji napụ ndị ogbenye ihe ruru ha nakwa ịnapụ ndị m a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi, na-emekwa ka ụmụ nwanyị di ha nwụrụ bụrụ anụ oriri ha na izunara ụmụ na-enweghị nne na nna ihe ha nwere.

3Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-abịa ileta unu? Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-eweta ịla nʼiyi, nke ga-esi nʼebe dị anya bịara unu? Onye ka unu ga-agbakwuru maka enyemaka? Ọ bụ ebe ka unu ga-ahapụ akụ unu niile?

4Mba, ọ dịghị ihe ga-afọdụ; karịa na a ga-egbu unu nʼihu ọgụ, maọbụ dọkpụrụ unu dịka ndị mkpọrọ. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.

5“Ahụhụ ga-adịrị Asịrịa onye bụ mkpara nke iwe m. Nʼaka ya ka mkpọ nke ọnụma m dị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.