4Nʼihi na dịka nʼụbọchị nke Midia, i gbajisiela ibu arọ niile e bokwasịrị ha, ihe mgbochi nke dị nʼubu ha, nke bụ mkpara ndị na-akpagbu ha.
5Nʼihi na akpụkpọụkwụ nke ndị agha na-eyi, na uwe agha nke ọbara mechuru, ha ga-abụ ihe a ga-agba ọkụ, ha ga-abụ ihe ndị ga-eme ka ọkụ ree nke ọma.
6Nʼihi na amụọrala anyị otu nwa, e nyekwala anyị otu nwa nwoke. Ọ ga-abụkwa onye ga-achị anyị. Ndị a ga-abụ aha ya, Onye Ndụmọdụ dị Ebube, Chineke bụ dike, Nna nke mgbe ebighị ebi, Eze Udo.
7Alaeze ya ga-aba ụba, ọchịchị eze ya ga-abụ nʼọnọdụ udo nke na-enweghị ọgwụgwụ. Ọ bụ nʼocheeze Devid ka ọ ga-anọkwasị, chịakwa nʼalaeze ya. Ọ ga-eme ka alaeze ahụ guzosie ike; ọ bụkwa ikpe ziri ezi na ezi omume ka ọ ga-eji chịa site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Ịnụ ọkụ nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-emezukwa nke a.
8Onyenwe anyị eziela ozi megide Jekọb ọ ga-adakwasịkwa Izrel.