2Ndị nọ na-agagharị nʼọchịchịrị ahụla ìhè dị ukwuu; ndị ahụ bi nʼala nke onyinyo ọnwụ ka ìhè nwukwasịrị.
3I meela ka mba ahụ baa ụba dịrị ukwuu, mee ka ọṅụ ha dịkwa ukwuu, ha na-enwe ọṅụ nʼihu gị, dịka ọṅụ nke ndị ọrụ ubi nʼoge owuwe ihe ubi, dịka ndị agha na-etegharị egwu ọṅụ mgbe ha na-ekesa ihe a kwatara nʼagha.
4Nʼihi na dịka nʼụbọchị nke Midia, i gbajisiela ibu arọ niile e bokwasịrị ha, ihe mgbochi nke dị nʼubu ha, nke bụ mkpara ndị na-akpagbu ha.
5Nʼihi na akpụkpọụkwụ nke ndị agha na-eyi, na uwe agha nke ọbara mechuru, ha ga-abụ ihe a ga-agba ọkụ, ha ga-abụ ihe ndị ga-eme ka ọkụ ree nke ọma.
6Nʼihi na amụọrala anyị otu nwa, e nyekwala anyị otu nwa nwoke. Ọ ga-abụkwa onye ga-achị anyị. Ndị a ga-abụ aha ya, Onye Ndụmọdụ dị Ebube, Chineke bụ dike, Nna nke mgbe ebighị ebi, Eze Udo.