Jeremaya 1

“Bilie ọtọ, jikere onwe gị, ka ị pụọ gaa gwa ha ihe ọbụla m nyere gị nʼiwu. Atụkwala ụjọ ha, ma ọ bụghị ya, aga m emenye gị egwu nʼihu ha.

Jeremiah 1:17 (UKJV) You therefore gird up your loins, and arise, and speak unto them all that I command you: be not dismayed at their faces, lest I confound you before them.

15Ma ugbu a, ana m akpọku ndị niile bi nʼalaeze dị nʼugwu,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “Ndị eze ha ga-abịa doo ocheeze ha nʼọnụ ụzọ ama e si abata Jerusalem, imegide ogologo mgbidi nke obodo ahụ gburugburu, na imegidekwa obodo niile nke Juda.

16Aga m ekwupụta ikpe niile m megide ha, nʼihi ajọ omume ha niile nʼịgbakụta m azụ, na isure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ, nakwa ịkpọ isiala nye ihe ndị ahụ niile ha ji aka ha kpụọ.

17“Bilie ọtọ, jikere onwe gị, ka ị pụọ gaa gwa ha ihe ọbụla m nyere gị nʼiwu. Atụkwala ụjọ ha, ma ọ bụghị ya, aga m emenye gị egwu nʼihu ha.

18Nʼihi na lee, site taa gaa nʼihu emeela m gị ka ị dịrị ka obodo e wusiri ike. Ị dịkwa ka mgbidi e ji igwe kpụọ, na dịka ibo e ji ọla dị arọ kpụọ, iguzogide ala ahụ niile. Iguzogide ndị eze Juda niile, ndịisi ala Juda niile, na ndị nchụaja niile, na ndị mmadụ ọzọ.

19Ha ga-agbalị ka ha megide gị, ma ha agaghị emeri gị. Nʼihi na mụ onwe m nọnyeere gị, aga m anapụtakwa gị.” Otu ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.