16Aga m ekwupụta ikpe niile m megide ha, nʼihi ajọ omume ha niile nʼịgbakụta m azụ, na isure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ, nakwa ịkpọ isiala nye ihe ndị ahụ niile ha ji aka ha kpụọ.
17“Bilie ọtọ, jikere onwe gị, ka ị pụọ gaa gwa ha ihe ọbụla m nyere gị nʼiwu. Atụkwala ụjọ ha, ma ọ bụghị ya, aga m emenye gị egwu nʼihu ha.
18Nʼihi na lee, site taa gaa nʼihu emeela m gị ka ị dịrị ka obodo e wusiri ike. Ị dịkwa ka mgbidi e ji igwe kpụọ, na dịka ibo e ji ọla dị arọ kpụọ, iguzogide ala ahụ niile. Iguzogide ndị eze Juda niile, ndịisi ala Juda niile, na ndị nchụaja niile, na ndị mmadụ ọzọ.
19Ha ga-agbalị ka ha megide gị, ma ha agaghị emeri gị. Nʼihi na mụ onwe m nọnyeere gị, aga m anapụtakwa gị.” Otu ka Onyenwe anyị kwubiri ya.