10Ma naanị Onyenwe anyị bụ Chineke nʼezie. Ọ bụ Chineke dị ndụ, na Eze nke ebighị ebi. Mgbe iwe were ya, ụwa na-ama jijiji. Mba niile apụghịkwa ịnagide iwe ya dị ọkụ.
11“Ihe ndị a ka unu ga-agwa ha, ‘Chi ndị ahụ niile a na-esiteghị nʼaka ha mee eluigwe na ụwa niile ga-ala nʼiyi. A ga-ewezuga ha site nʼụwa na nʼokpuru eluigwe niile.’ ”
12Ma Chineke sitere nʼike ya mee ụwa. Ọ tọrọ ntọala ụwa mee ka o guzosie ike site nʼamamihe ya, ọ jikwa nghọta ya setịpụ eluigwe niile.
13Mgbe o bigbọrọ, mmiri niile nke dị nʼeluigwe na-ebigbọkwa. Ọ na-eme ka igwe ojii site na nsọtụ niile nke ụwa kwụlie. Ọ na-ezipụ amụma mgbe mmiri na-ezo, na-esitekwa nʼụlọ nkwakọba ihe ya niile na-ewepụta ifufe.
14Onye ọbụla bụ onye na-enweghị uche nke ihe ọmụma kọrọ. Emeela ka ihere mee onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ọbụla site nʼarụsị ọ kpụrụ. Nʼihi na oyiyi niile ọ na-akpụ bụ aghụghọ; ha enweghị nkuume ọbụla nʼime ha.