15Ha bụ ihe efu, na ihe ịkwa emo, mgbe ikpe ọmụma ha bịakwasịrị ha, ha ga-ala nʼiyi.
16Ma Onye ahụ bụ Oke Jekọb adịghị ka ihe ndị a, nʼihi na Ọ bụ ya na-eke ihe niile, tinyere Izrel bụ ebo nke ihe nketa ya. Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.
17Chịkọtaanụ ngwongwo unu niile; nọọnụ na njikere ịhapụ ala a, nʼihi na lee, ndị iro gbara unu gburugburu.
18Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Nʼoge a, aga m amafu ndị niile bi nʼala a. M ga-eme ka oke mkpagbu bịakwasị ha, meekwa ka ndị iro ha jide ha.”
19Ahụhụ dịịrị m nʼihi mmerụ ahụ m merụrụ. Ọnya dị m nʼahụ enweghị ọgwụgwọ. Ma ana m akasị onwe m obi na-asị, “Nʼezie, ọrịa a dakwasịrị m bụ ọrịa m, aga m edikwa ya.”