1Nụrụnụ ihe Onyenwe anyị na-agwa unu, ụmụ Izrel.
2Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Unu amụtala ụzọ ndị mba ọzọ, unu atụkwala ụjọ ihe ịrịbama niile nke na-apụta ihe na mbara eluigwe, ọ bụ ezie na ndị mba dị iche iche na-atụ ha ụjọ.
3Nʼihi na omenaala ndị mmadụ ahụ abaghị uru. Ha na-aba nʼọhịa gbute osisi, nke onye ǹka osisi na-eji anyụike pịara ha ihe.
4Ha na-eji ọlaọcha na ọlaedo chọọ ihe ahụ a pịrị apị mma, jiri mkpirisi igwe na ǹtu kụọ ya ka o sie ike, ka ọ ghara ịda.
5Arụsị ha yiri osisi eguzobere nʼubi kukumba maka iji chụọ anụ ufe ọsọ, ha adịghị ekwu okwu. A na-ebugharị ha nʼaka nʼihi na ha adịghị eje ije. Unu atụla ha egwu, nʼihi na ha apụghị imerụ unu ahụ, ha enwekwaghị ike imere unu ihe ọma ọbụla.”