5Arụsị ha yiri osisi eguzobere nʼubi kukumba maka iji chụọ anụ ufe ọsọ, ha adịghị ekwu okwu. A na-ebugharị ha nʼaka nʼihi na ha adịghị eje ije. Unu atụla ha egwu, nʼihi na ha apụghị imerụ unu ahụ, ha enwekwaghị ike imere unu ihe ọma ọbụla.”
6O nweghị onye dịka gị, Onyenwe anyị. Ị dị ukwuu. Aha gị dị ukwuu, na-arụpụtakwa ihe dị ike.
7Onye ka ọ bụ nke na-ekwesighị ịtụ gị egwu? Ọ bụ gị bụ eze mba niile. Ọ bụkwa gị ka e kwesiri ịtụ egwu. Nʼetiti ndị niile maara ihe na mba niile, na nʼalaeze niile, ọ dịghị onye dịka gị.
8Ha niile bụ ndị na-enweghị uche na ndị nzuzu. Ọ bụkwa arụsị osisi na-abaghị uru na-ezi ha ihe.
9A na-esite na Tashish bubata ọlaọcha e tipịaziri nke ọma, site na Ụfaz bubata ọlaedo. Ihe ahụ nke ọka osisi pịrị, nke ndị ọkpụ ụzụ ọlaedo chọrọ mma ka a na-eyikwasị uwe na-acha anụnụ anụnụ, na uwe na-acha odo odo. Ọ bụkwa ndị ǹka dị iche iche na-eme ha niile.