15“Gịnị ka onye m hụrụ nʼanya na-eme nʼime ụlọnsọ ukwuu m, mgbe ya na ọtụtụ ndị ọzọ na-ejikọta onwe ha nʼotu ịtụ atụmatụ ihe ọjọọ? Anụ e doro nsọ apụghị ime ka ahụhụ unu kwesiri ịnata hapụ ịbịakwasị unu. A sị na o si otu a dịrị, mgbe ahụ, unu pụrụ ịṅụrị ọṅụ mgbe unu na-eme ihe ọjọọ unu.”
16Aha Onyenwe anyị nyere gị bụ Osisi oliv dị ndụ, nke na-amị mkpụrụ mara mma. Ma ọ bụ olu mkpọtụ nke oke mmiri ozuzo ka ọ ga-eji mụkwasị gị ọkụ; alaka gị ga-agbajisikwa.
17Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ onye ahụ kụnyere gị nʼala, e nyela iwu na mbibi ga-abịakwasị gị, nʼihi na ndị Izrel na Juda emeela ihe ọjọọ, kpasuo m iwe site nʼịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Baal.
18Ọ bụ Onyenwe anyị kpughere izuzu ọjọọ ha nye m; amatakwara m ihe ha na-ezube, nʼihi na o gosiri m ya nʼoge ahụ.
19Mụ onwe m dị ka nwa atụrụ dị nwayọọ nke e du na-aga ebe a ga-egbu ya. Ma aghọtaghị m na ọ bụ m ka ha zubererị nzube ọjọọ megide. Ha kwuru sị, “Bịanụ ka anyị bibie osisi a na mkpụrụ ya. Ka anyị site nʼala ndị dị ndụ wezuga ya, ka a hapụ ichetakwa aha ya ọzọ”