Jeremaya 11

Ọ bụ Onyenwe anyị kpughere izuzu ọjọọ ha nye m; amatakwara m ihe ha na-ezube, nʼihi na o gosiri m ya nʼoge ahụ.

Jeremiah 11:18 (UKJV) And the LORD has given me knowledge of it, and I know it: then you showed me their doings.

16Aha Onyenwe anyị nyere gị bụ Osisi oliv dị ndụ, nke na-amị mkpụrụ mara mma. Ma ọ bụ olu mkpọtụ nke oke mmiri ozuzo ka ọ ga-eji mụkwasị gị ọkụ; alaka gị ga-agbajisikwa.

17Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ onye ahụ kụnyere gị nʼala, e nyela iwu na mbibi ga-abịakwasị gị, nʼihi na ndị Izrel na Juda emeela ihe ọjọọ, kpasuo m iwe site nʼịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Baal.

18Ọ bụ Onyenwe anyị kpughere izuzu ọjọọ ha nye m; amatakwara m ihe ha na-ezube, nʼihi na o gosiri m ya nʼoge ahụ.

19Mụ onwe m dị ka nwa atụrụ dị nwayọọ nke e du na-aga ebe a ga-egbu ya. Ma aghọtaghị m na ọ bụ m ka ha zubererị nzube ọjọọ megide. Ha kwuru sị, “Bịanụ ka anyị bibie osisi a na mkpụrụ ya. Ka anyị site nʼala ndị dị ndụ wezuga ya, ka a hapụ ichetakwa aha ya ọzọ”

20Ma gị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi, na-anwapụtakwa obi mmadụ na mmụọ ya. Mee ka m hụ mgbe ị ga-abọ ọbọ megide ha, nʼihi na ọ bụ nʼaka gị ka m na-etinye okwu a metụtara m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.