Jeremaya 11

Ya mere, nke a ka Onyenwe anyị na-ekwu banyere ndị Anatot ahụ na-achọ ịnapụ gị ndụ gị, ndị ahụ na-asị gị, “Ebukwala amụma site nʼaha Onyenwe anyị ka ị ghara ịnwụ nʼaka anyị.”

Jeremiah 11:21 (UKJV) Therefore thus says the LORD of the men of Anathoth, that seek your life, saying, Prophesy not in the name of the LORD, that you die not by our hand:

19Mụ onwe m dị ka nwa atụrụ dị nwayọọ nke e du na-aga ebe a ga-egbu ya. Ma aghọtaghị m na ọ bụ m ka ha zubererị nzube ọjọọ megide. Ha kwuru sị, “Bịanụ ka anyị bibie osisi a na mkpụrụ ya. Ka anyị site nʼala ndị dị ndụ wezuga ya, ka a hapụ ichetakwa aha ya ọzọ”

20Ma gị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi, na-anwapụtakwa obi mmadụ na mmụọ ya. Mee ka m hụ mgbe ị ga-abọ ọbọ megide ha, nʼihi na ọ bụ nʼaka gị ka m na-etinye okwu a metụtara m.

21Ya mere, nke a ka Onyenwe anyị na-ekwu banyere ndị Anatot ahụ na-achọ ịnapụ gị ndụ gị, ndị ahụ na-asị gị, “Ebukwala amụma site nʼaha Onyenwe anyị ka ị ghara ịnwụ nʼaka anyị.”

22Nʼihi nke a Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, sị, “Aga m ata ha ahụhụ. Ụmụ okorobịa ha ga-anwụ site na mma agha, ụnwụ ga-egbukwa ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom.

23O nweghị ndị ga-afọdụ ndụ nʼime ha nʼihi na a ga-eme ka oke mbibi bịakwasị ndị Anatot nʼafọ ahụ m ga-ata ha ahụhụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.