20Welienụ anya unu ka unu hụrụ ndị ahụ si nʼugwu na-abịa. Ebee ka igwe ewu na atụrụ ndị ahụ e tinyere unu nʼaka nọ, igwe ewu na atụrụ ahụ unu ji na-anya isi?
21Gịnị ka ị ga-asị mgbe Onyenwe anyị mere ka ndị ahụ ị gụrụ dịka ndị enyi gị bịa buso gị agha? Ihe mgbu nke ga-abịakwasị gị ọ gaghị adị ka ihe mgbu na-abịakwasị nwanyị ime na-eme?
22Mgbe ahụ, ị ga-ajụkwa obi gị ajụjụ sị, “Gịnị mere ihe ndị a ji dakwasị m?” Ọ bụ nʼihi ịba ụba nke mmehie gị ka e ji dọwaa uwe mwụda gị, merụọ gị ahụ nʼakụkụ ahụ gị niile.
23Onye Kush ọ pụrụ ịgbanwe akpụkpọ ahụ ya? Agụ ọ pụrụ ịgbanwe akpụkpọ ahụ ya tụrụ agwa agwa? Nʼụzọ dị otu a kwa, unu ndị ihe ọjọọ riri ahụ apụghị ime ezi ihe.
24“Aga m efesasị unu dịka ahịhịa ọka kpọrọ nkụ, nke oke ifufe si nʼọzara na-ebugharị.