17Ana m ahụzu ụzọ ha niile. O nweghị ihe zoro ezo nʼebe m nọ. Anya m na-ahụzukwa mmehie ha niile.
18Aga m akwụghachi ha okpukpu abụọ nʼihi ajọ omume ha, na mmehie ha, nʼihi na ha ejirila oyiyi ihe arụ a pịrị apị ha, nke na-enweghị ndụ nʼime ya, merụọ ala m. Ha emeekwala ka arụsị bụ ihe arụ jupụta nʼihe nketa m.”
19Onyenwe anyị, ị bụ ike m na ebe m e wusiri ike, ebe mgbaba m nʼoge nsogbu. Mba niile nke ụwa ga-esite na nsọtụ ụwa niile bịakwute gị. Ha ga-abịakwute gị sị gị, “Nna anyị ha enweghị ihe ọbụla karịakwa chi ndị na-abụghị chi nʼezie. Ha bụkwa chi na-abaghị uru, nke na-adịghị ewetara ha ihe ọma ọbụla.”
20Mmadụ ọ pụrụ imere onwe ya chi? E, ma chi ndị ahụ abụghị chi.
21“Ya mere, aga m eme ka ha mata. Nʼoge a ka m ga-eme ka ha mata ike m, na ịdị ike m. Mgbe ahụ, ha ga-amata na aha m bụ Onyenwe anyị.