7O nweghị onye ga-eweta ihe oriri nye ndị zukọrọ maka ịkasị ndị na-eru ụjụ obi. Nri agaghị adị ọ bụladị nye ndị na-eru ụjụ, nʼihi ọnwụ nna ha maọbụ ọnwụ nne ha. Ọ dịkwaghị onye ga-enye ha ihe ọṅụṅụ nʼihi ịkasị ha obi.
8“Abanyekwala nʼụlọ ebe e nwere oriri soro ndị nọ nʼebe ahụ nọdụ ala iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ
9Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụkwa Chineke Izrel kwuru, ‘Nʼihu gị, na nʼoge ndị a niile ị dị ndụ, ka m ga-eme ka ụzụ ọṅụ na obi ụtọ, na olu ndị ikom na nke ndị inyom na-alụ di na nwunye kwụsị.’
10“Mgbe ị gwara ndị a ihe ndị a, ha ga-ajụ gị ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji kpebie izitere anyị ụdị oke ịla nʼiyi dị otu a? Gịnị bụ ihe ọjọọ anyị mere? Gịnị bụ mmehie anyị mere megide Onyenwe anyị Chineke anyị?’
11Mgbe ahụ, ị ga-asa ha sị ha, ‘Ihe ndị a na-adakwasị unu nʼihi na nna nna unu ha gbakụtara m azụ,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘gbasoro, fee ma kpọọkwa isiala nye chi ndị ọzọ. Ha jụrụ iso m, jụkwa idebe ihe m nyere ha nʼiwu.