12Ma ha ga-aza sị, ‘O nweghị isi! Anyị ga-anọgide na-eme ihe ọbụla anyị chepụtara nʼechiche anyị, na-emekwa atụmatụ isiike nke obi ọjọọ anyị tụpụtara.’ ”
13Nʼihi ya ka Onyenwe anyị ji kwuo sị, “Jụtanụ ajụjụ nʼetiti mba niile, onye nụrụla ihe dị otu a? Ndị m, Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke emeela ihe jọgburu onwe ya.
14O nweela mgbe mmiri oyi m mere ka ọ kpụkọtaa kọrọ nʼelu ugwu Lebanọn? O nweela mgbe mmiri ya jụrụ oyi, nke si nʼebe dị anya na-asọdata ji akwụsị ịsọ asọ?
15Ma ndị m echezọọla m. Ha na-achụ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye arụsị na-enweghị isi, bụ arụsị ndị ahụ mere ka ha sọọ ngọngọ nʼụzọ ha niile. Ha sụrụ ngọngọ hapụ ịgbasokwa ụzọ ọma ahụ dị site na mgbe ochie. Kama ha na-eje ije nʼụzọ ọhịa, nke na-enweghị ụkpụrụ, nke a na-ewuzighị ewuzi.
16Ala ha ga-atọgbọrọ nʼefu. Ọ ga-aghọ ihe iju anya ruo ebighị ebi. Ndị si nʼakụkụ ya na-agafe ga-efufe isi ha, nʼihi na ihe ha ga-ahụ ga-eju ha anya.