13Nʼihi ya ka Onyenwe anyị ji kwuo sị, “Jụtanụ ajụjụ nʼetiti mba niile, onye nụrụla ihe dị otu a? Ndị m, Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke emeela ihe jọgburu onwe ya.
14O nweela mgbe mmiri oyi m mere ka ọ kpụkọtaa kọrọ nʼelu ugwu Lebanọn? O nweela mgbe mmiri ya jụrụ oyi, nke si nʼebe dị anya na-asọdata ji akwụsị ịsọ asọ?
15Ma ndị m echezọọla m. Ha na-achụ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye arụsị na-enweghị isi, bụ arụsị ndị ahụ mere ka ha sọọ ngọngọ nʼụzọ ha niile. Ha sụrụ ngọngọ hapụ ịgbasokwa ụzọ ọma ahụ dị site na mgbe ochie. Kama ha na-eje ije nʼụzọ ọhịa, nke na-enweghị ụkpụrụ, nke a na-ewuzighị ewuzi.
16Ala ha ga-atọgbọrọ nʼefu. Ọ ga-aghọ ihe iju anya ruo ebighị ebi. Ndị si nʼakụkụ ya na-agafe ga-efufe isi ha, nʼihi na ihe ha ga-ahụ ga-eju ha anya.
17Aga m achụsa ha nʼihu ndị iro ha dịka ifufe na-efe site nʼọwụwa anyanwụ. Aga m agbakụta ha azụ. Ha agaghị ahụkwa ihu m anya nʼụbọchị ahụ mbibi ga-abịakwasị ha.”