Jeremaya 18

Aga m achụsa ha nʼihu ndị iro ha dịka ifufe na-efe site nʼọwụwa anyanwụ. Aga m agbakụta ha azụ. Ha agaghị ahụkwa ihu m anya nʼụbọchị ahụ mbibi ga-abịakwasị ha.”

Jeremiah 18:17 (UKJV) I will scatter them as with an east wind before the enemy; I will show them the back, and not the face, in the day of their calamity.

15Ma ndị m echezọọla m. Ha na-achụ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye arụsị na-enweghị isi, bụ arụsị ndị ahụ mere ka ha sọọ ngọngọ nʼụzọ ha niile. Ha sụrụ ngọngọ hapụ ịgbasokwa ụzọ ọma ahụ dị site na mgbe ochie. Kama ha na-eje ije nʼụzọ ọhịa, nke na-enweghị ụkpụrụ, nke a na-ewuzighị ewuzi.

16Ala ha ga-atọgbọrọ nʼefu. Ọ ga-aghọ ihe iju anya ruo ebighị ebi. Ndị si nʼakụkụ ya na-agafe ga-efufe isi ha, nʼihi na ihe ha ga-ahụ ga-eju ha anya.

17Aga m achụsa ha nʼihu ndị iro ha dịka ifufe na-efe site nʼọwụwa anyanwụ. Aga m agbakụta ha azụ. Ha agaghị ahụkwa ihu m anya nʼụbọchị ahụ mbibi ga-abịakwasị ha.”

18Ha sịrị, “Bịanụ ka anyị gbaa izu megide Jeremaya, nʼihi na izi iwu agaghị esite nʼebe ndị nchụaja nọ kwụsị, maọbụ ndụmọdụ nʼebe ndị maara ihe, ma ọ bụkwanụ okwu site nʼebe ndị amụma nọ. Ya mere, bịanụ ka anyị were ire anyị buso ya agha, gharakwa ịṅa ntị nʼokwu ọbụla nke ọ na-ekwu.”

19Gee m ntị, Onyenwe anyị. Nụrụ ihe ndị na-ebo m ebubo na-ekwu megide m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.