Jeremaya 18

O kwesiri iji ajọ omume kwụghachi ihe ọma? Ma lee na ha egwuolara m olulu. Chetakwa na m guzooro nʼihu gị ma rịọ gị arịrịọ nʼihi ha. Arịrịọ m bụ ka ị hapụ iweso ha oke iwe.

Jeremiah 18:20 (UKJV) Shall evil be recompensed for good? for they have dug a pit for my soul. Remember that I stood before you to speak good for them, and to turn away your wrath from them.

18Ha sịrị, “Bịanụ ka anyị gbaa izu megide Jeremaya, nʼihi na izi iwu agaghị esite nʼebe ndị nchụaja nọ kwụsị, maọbụ ndụmọdụ nʼebe ndị maara ihe, ma ọ bụkwanụ okwu site nʼebe ndị amụma nọ. Ya mere, bịanụ ka anyị were ire anyị buso ya agha, gharakwa ịṅa ntị nʼokwu ọbụla nke ọ na-ekwu.”

19Gee m ntị, Onyenwe anyị. Nụrụ ihe ndị na-ebo m ebubo na-ekwu megide m.

20O kwesiri iji ajọ omume kwụghachi ihe ọma? Ma lee na ha egwuolara m olulu. Chetakwa na m guzooro nʼihu gị ma rịọ gị arịrịọ nʼihi ha. Arịrịọ m bụ ka ị hapụ iweso ha oke iwe.

21Ya mere, were ụmụ ha nyefee nʼaka ụnwụ. Werekwa ha onwe ha nyefee nʼaka mma agha. Mee ka ndị nwunye ha ghọọ ndị gba aka ụmụ na di. Meekwa ka e gbuo ndị ikom ha, ka mma agha gbukwaa ụmụ okorobịa nʼọgbọ agha.

22Mee ka e site nʼụlọ ha nụ mkpu akwa, mgbe i mere ka ndị iro ha buso ha agha na mberede. Nʼihi na ha egwuola olulu ijide m, ha esiekwarala m ọnya nzuzo ijide m nʼụkwụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.