Jeremaya 18

Ma gị onwe gị, Onyenwe anyị, maara nzube ọjọọ ha niile igbu m. Agbagharala ha ajọ omume ha; maọbụ hichapụ mmehie ha site nʼihu gị. Mee ka ụkwụ ha gbuchapụ ka ha daa nʼihu gị; mesie ha ike mgbe ị na-ewe iwe.

Jeremiah 18:23 (UKJV) Yet, LORD, you know all their counsel against me to slay me: forgive not their iniquity, neither blot out their sin from your sight, but let them be overthrown before you; deal thus with them in the time of yours anger.

21Ya mere, were ụmụ ha nyefee nʼaka ụnwụ. Werekwa ha onwe ha nyefee nʼaka mma agha. Mee ka ndị nwunye ha ghọọ ndị gba aka ụmụ na di. Meekwa ka e gbuo ndị ikom ha, ka mma agha gbukwaa ụmụ okorobịa nʼọgbọ agha.

22Mee ka e site nʼụlọ ha nụ mkpu akwa, mgbe i mere ka ndị iro ha buso ha agha na mberede. Nʼihi na ha egwuola olulu ijide m, ha esiekwarala m ọnya nzuzo ijide m nʼụkwụ.

23Ma gị onwe gị, Onyenwe anyị, maara nzube ọjọọ ha niile igbu m. Agbagharala ha ajọ omume ha; maọbụ hichapụ mmehie ha site nʼihu gị. Mee ka ụkwụ ha gbuchapụ ka ha daa nʼihu gị; mesie ha ike mgbe ị na-ewe iwe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.