1Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Jee, zụta otu ite aja site nʼaka ọkpụ ite. Duru ụfọdụ nʼime ndị okenye na ndị nchụaja,
2jee na Ndagwurugwu nke Ben Hinom, nke dị nso nʼọnụ ụzọ ama Ejuju dị nʼọwụwa anyanwụ. Nọdụ nʼebe ahụ kwupụtara ha okwu ndị m gwara gị.
3Sị ha, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị eze Juda, na ndị Jerusalem. Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke Izrel kwuru. Geenụ ntị! Aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị ala a, ụdị ihe ọjọọ ga-eme ka ntị ọbụla nụrụ ya zụọ wuruwuru.