7“ ‘Nʼebe a ka m ga-anọ laa nzube niile nke Juda na Jerusalem nʼiyi. Aga m eme ka ha daa site na mma agha nʼihu ndị iro ha, nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ ha ike. Aga m enye ụmụ anụ ufe na anụ ọhịa ozu ha dịka nri.
8Aga m ebibi obodo a mee ka ọ ghọọ ihe iju anya na ihe ịma ọsụ. Ndị niile na-esi nʼakụkụ ya agafe ga-anọ nʼọnọdụ iju anya, ha ga-eledakwa ya anya nʼihi ọnya ya niile.
9Aga m emekwa ka ha rie anụ ahụ nke ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. Ha ga-erikwa anụ ahụ ibe ha, nʼihi na ndị iro ha ga-agba ha gburugburu nọchibido ha nʼime oke mkpagbu ka ha bibie ndụ ha.’
10“Kụwaa ite ahụ mgbe ndị gị na ha so nọ na-ele gị anya.
11Gwa ha sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile sịrị: Aga m etipịa mba a na obodo a, dịka ite aja nke ọkpụ ite a si daa tipịasịa nʼụzọ a na-apụghị imezikwa ya ọzọ. Ha ga-eli ndị nwụrụ anwụ na Tofet tutu ruo mgbe ohere na-agaghị adịkwa ili ozu ọzọ.