11O nwerela mba gbanwere chi ndị ha na-efe? (Ọ bụ ezie na ha abụghị chi.) Ma ndị m ewerela arụsị na-enweghị isi gbanwere ebube ha.
12Ka ibubo nwụọ gị, gị eluigwe nʼihi nke a, maa jijiji, tụọkwa oke ụjọ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
13“Nʼihi na ndị m emeela ihe ọjọọ abụọ. Ha agbakụtala m azụ, bụ Isi iyi mmiri ndụ, gwuoro onwe ha ebe ichebe mmiri nke tipuru etipu na-enweghị ike ịnagide mmiri ọbụla.
14Izrel ọ bụ ohu, ka ọ bụ ohu a mụrụ nʼụlọ? Gịnị mere o ji ghọọ ihe nlụta nʼagha?
15Ọdụm agbọọla ụja, ha ebigbọọla meekwa ka ọ nụ olu ha. Ha ebibiela obodo ya laa ya nʼiyi, suo ya ọkụ, nke mere na o nweghị onye bi na ha.