Jeremaya 2

Ugbu a, gịnị bụ uru unu nwetara site nʼịga Ijipt sitekwa nʼịṅụ mmiri nke osimiri Naịl? Gịnị bụ uru unu nwetara site nʼịga Asịrịa, sitekwa nʼịṅụ mmiri si na Yufretis?

Jeremiah 2:18 (UKJV) And now what have you to do in the way of Egypt, to drink the waters of Sihor? or what have you to do in the way of Assyria, to drink the waters of the river?

16Ọzọkwa, ndị ikom Memfis na Tapanhis a kupuola gị isi.

17Ọ bụghị unu onwe unu wetaara onwe unu ihe ọjọọ dị otu a site na ịhapụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, mgbe ọ na-edu unu na-aga nʼụzọ?

18Ugbu a, gịnị bụ uru unu nwetara site nʼịga Ijipt sitekwa nʼịṅụ mmiri nke osimiri Naịl? Gịnị bụ uru unu nwetara site nʼịga Asịrịa, sitekwa nʼịṅụ mmiri si na Yufretis?

19Ọ bụ ajọ omume unu ga-ewetara unu ahụhụ; ahụhụ soo ndaghachi azụ unu bụ ihe ga-adọ unu aka na ntị. Tulee ma matanụ nʼonwe unu otu o si bụrụ ihe ọjọọ na ihe ilu nye unu bụ inupu isi na ịgbakụta Onyenwe anyị bụ Chineke unu azụ na-enweghị egwu ọbụla nʼime unu banyere m,” nke a bụ ihe Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, kwupụtara.

20“Nʼoge gara aga, unu gbajiri yoku unu dọkapụ agbụ jikọtara mụ na unu, unu sịrị, ‘Agaghị m ejere gị ozi.’ Nʼezie, ọ bụ nʼelu ugwu ọbụla nakwa nʼokpuru osisi na-agbasa agbasa, ka ị na-edina dịka onye akwụna.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.