1Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m na-asị,
2“Gaa, kwupụta na ntị Jerusalem, “Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Echetara m ịnụ ọkụ nʼobi nke okorobịa gị nʼoge gara aga ime ihe ga-atọ m ụtọ, ịhụnanya gị dịka onye a lụrụ ọhụrụ, echetakwara m otu unu si soro m nʼime ọzara, ga nʼala tọgbọrọ nʼefu nke a na-akụghị mkpụrụ.
3Izrel bụ ihe dị nsọ nye Onyenwe anyị, mkpụrụ mbụ nke owuwe ihe ubi ya. Ndị niile ripịara ya ka a gụrụ dị ka ndị ikpe mara. Ihe ọjọọ dakwasịkwara ha.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
4Nụrụ okwu nke Onyenwe anyị unu ụlọ Jekọb, na unu ndị bụ agbụrụ niile sitere nʼIzrel.
5Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, “Gịnị bụ ihe ọjọọ nna unu ha chọpụtara nʼime m, mere ha ji si nʼebe m nọ kpafuo, nọrọ m ebe dị anya? Nke mere na ha ghọrọ ndị nzuzu site nʼịgbaso arụsị?